Psalms 122

Abụ nrigo, nke Devid.

Ekpere maka udo Jerusalem

1Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,
“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a
nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.

3E wuru Jerusalem dịka obodo
a chịkọtara ọnụ nke ọma.
4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,
bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,
ịbụku aha Onyenwe anyị abụ
dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,
bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:
“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile
nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,
ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,
aga m achọ ọganihu gị.
Copyright information for IboBIU